Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

4 | Ndụmọdụ Baịbụl Na-enye Na-aba Ezigbo Uru

4 | Ndụmọdụ Baịbụl Na-enye Na-aba Ezigbo Uru

BAỊBỤL KWURU, SỊ: ‘Ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ bara uru.’​—2 TIMOTI 3:16.

Ihe Ọ Pụtara

Ọ bụ eziokwu na Baịbụl abụghị akwụkwọ ahụ́ ike, ma ndụmọdụ ndị dị na ya na-abara anyị ezigbo uru. Ndụmọdụ ndị a nwere ike inyere onye isi na-akpakọchaghị ọnụ aka. Legodị ụfọdụ n’ime ha.

Otú Ihe A Nwere Ike Isi Nyere Anyị Aka

“Ndị ahụ́ dị anaghị achọ onye ga-agwọ ha, kama ọ bụ ndị ahụ́ na-adịghị na-achọ ya.”​—MATIU 9:12.

Ihe Baịbụl kwuru gosiri na o nwere ike ịdị mkpa ka anyị gaa ụlọ ọgwụ ka a gwọọ anyị. E nyerela ọtụtụ ndị isi na-akpakọchaghị ọnụ aka ka ha mata ihe bụ́ eziokwu gbasara nsogbu ha, ndị dọkịta enyekwarala ọtụtụ n’ime ha aka.

‘Mmadụ imega ahụ́ bara uru.’​—1 TIMOTI 4:8, na ihe e dere n’ala ala peeji ya.

Mmadụ iwepụta oge na-eme ihe ndị ga-eme ka ahụ́ gbasie ya ike na-eme ka isi na-akpakọkwu ya ọnụ. Ihe ndị so na ha bụ ịna-emega ahụ́ mgbe niile, ịna-eri nri na-edozi ahụ́, na ịna-ehi ụra nke ọma.

“Obi ụtọ bụ ezigbo ọgwụ nke na-agwọ mmadụ ọrịa, ma obi ọjọọ na-eme ka ike na-agwụ mmadụ.”​—ILU 17:22.

Mmadụ ịgụ ebe dị iche iche na-agba ume na Baịbụl nakwa ikpebi ime ihe ndị ọ ga-emeli nwere ike inyere ya aka ka ọ na-enwe obi ụtọ. Inwe obi ike na inwe olileanya na ihe ga-emecha dị mma nwere ike inyere gị aka ka obi na-eru gị ala nakwa ka ị na-edi nsogbu ndị ị na-enwe maka na isi akpakọchaghị gị ọnụ.

“Onye dị umeala n’obi ma ihe.”​—ILU 11:2.

I nwere ike ịchọpụta na ọ bụghị ihe niile ị chọrọ ime ka ị ga-emeli n’onwe gị. N’ihi ya, jiri obi gị niile na-ekweta ka ndị ọzọ na-enyere gị aka. O nwere ike ịbụ na ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị chọrọ ịna-enyere gị aka. Ma, e nwere ike ha amaghị ihe ha kwesịrị ime. Mee ka ha mata ihe ha ga-eme ga-akacha abara gị ezigbo uru. Atụla anya na ha ga na-emere gị ihe niile ị chọrọ ka ha mee, na-ekelekwa ha mgbe niile maka aka ha na-enyere gị.

Ezigbo Ndụmọdụ Baịbụl Na-enye Na-abara Ndị Isi Na-akpakọchaghị Ọnụ Uru

“Ọ nọ na-adị m ka è nwere ihe na-adịchaghị mma n’ahụ́ m. N’ihi ya, m gara hụ dọkịta. O lere m ahụ́ chọpụta ihe na-eme m. Ihe a nyeere m aka iwere ụwa m otú m si hụ ya, nyekwara m aka ịmata ụdị ọgwụ ndị nwere ike inyere m aka n’ọrịa m.”​—Nicole, a onye na-arịa ọrịa na-aghasa ya ụbụrụ.

“Achọpụtala m na Baịbụl mụ na nwunye m na-agụchi anya na-enyere m aka iji ihe ndị na-eme obi ụtọ na ihe na-agba ume amalite ụbọchị ọ bụla. Ọtụtụ mgbe, n’ụbọchị ihe siiri m ike, a na-enwe otu amaokwu Baịbụl na-akasi m obi.”​—Peter, onye na-arịa isi mgbaka.

“Ọ na-esiri m ike ịkọrọ ndị ọzọ gbasara ọrịa m n’ihi na ọ na-eme m ezigbo ihere. Ma, ezigbo enyi m gere m ntị nke ọma ma gbalịa ịghọta otú obi dị m. O nyeere m ezigbo aka ka obi dịtụ m mma, meekwa ka m ghọta na e nwekwara ndị ọzọ ọ dị otú ọ dị m.”​—Ji-yoo, onye na-arịa ọrịa na-eme ka ọ na-eri nri otú na-ekwesịghị ekwesị.

“Baịbụl enyerela m aka ịma ebe ike m ruru, mee ka m mụta ịna-ezu ike nke ọma ma ghara ịna-arụfe ọrụ ókè. Amamihe dị na Baịbụl enyerela m aka ịma ihe m kwesịrị ime mgbe ọ bụla ihe na-adịghị mma batara m n’obi.”​—Timothy, onye na-arịa ọrịa na-eme ka ọ na-echegbukarị onwe ya.

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.