Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Kwere Nkwa na Ọ Ga-eme Ka Isi Zuo Ndị Mmadụ Okè

Chineke Kwere Nkwa na Ọ Ga-eme Ka Isi Zuo Ndị Mmadụ Okè

Chineke si na Baịbụl na-agwa ndị isi na-akpakọchaghị ọnụ ihe ndị ga-enyere ha aka idi nsogbu ha, na-akasikwa ha obi.

Ma, Chineke emeedịla ihe karịrị nke ahụ. O kwela nkwa na ya ga-eme ka a gharazie inwe ọrịa ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ na-eme ka isi ghara ịkpakọ mmadụ ọnụ.

Mgbe Chineke ga-emezu nkwa a, “a gaghịzi echeta” obi mgbawa, nchegbu, na ihe ọjọọ ndị na-abata mmadụ n’uche. “Ha agaghị abatakwa n’obi.”​—Aịzaya 65:17.

Obi ga-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ka ị mata mgbe Chineke ga-emezu nkwa a na-akasi obi nakwa otú ọ ga-esi emezu ya.