Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ndị nwụrụ anwụ hà ga-adị ndụ ọzọ?

Ọnwụ yiri ụra n’ihi na onye nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, o nweghịkwa ike ime ihe ọ bụla. Ma, Onye na-enye ndụ ga-emeli ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ. Otú ọ ga-esi eme ya bụ na ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ. Chineke gosiri na ya ga-eme nke a. Ọ bụ ya mere o ji nye Jizọs ike o ji kpọlite ụfọdụ ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.—Gụọ Ekliziastis 9:5; Jọn 11:11, 43, 44.

Olee otú o si bụrụ na ọnwụ yiri ụra?

Chineke ekwela nkwa na ya ga-akpọlite ndị niile ọ chọrọ icheta. Ya kpọlite ha, ha adịrị ndụ n’ụwa ọhụrụ ya. Ndị niile ahụ ọ ga-akpọlite ka ga-abụ ndị nwụrụ anwụ ruo mgbe ọ ga-akpọlite ha. Ọ na-agụsi Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile agụụ ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.—Gụọ Job 14:14, 15.

Olee ihe ga-eme mgbe a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ?

Mgbe Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ha ga-amata ibe ha, mata ndị enyi ha, nakwa ndị ezinụlọ ha. Ọ bụrụgodị na onye nwụrụ anwụ erekasịchaala, Chineke ga-eme ka o nwee ahụ́ ọhụrụ mgbe ọ ga-akpọlite ya.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:35, 38.

Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha dịrị ndụ n’eluigwe. (Mkpughe 20:6) Ọtụtụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-adị ndụ n’ụwa mgbe a ga-eme ka ụwa bụrụ paradaịs. Ha nweziri ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.—Gụọ Abụ Ọma 37:29; Ọrụ Ndịozi 24:15.