Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

À ga-emecha nwee otu ọchịchị ga na-achị ụwa niile?

Olee otú otu ọchịchị ga na-achị ụwa niile ga-esi mee ka mba niile dị n’otu? Aịzaya 32:1, 17; 54:13

Í cheghị na ọ ga-abara ụmụ mmadụ ezigbo uru ma e nwee otu ọchịchị na-achị ụwa niile? Ọtụtụ ndị taa na-atagbu onwe ha n’ahụhụ n’ihi na ha dara ogbenye. Ma, e nwee otu ọchịchị dị mma ga na-achị ụwa niile, onye ọ bụla ga na-enweta ihe dị ya mkpa. Ì chere na ụmụ mmadụ ga-emeli ka e nwee ụdị ọchịchị a?—Gụọ Jeremaya 10:23.

Kemgbe ụwa, ndị ọchịchị enwebeghị ike igboro ndị ha na-achị mkpa ha, nke ka nke, ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha. Obi tadịrị ụfọdụ ndị ọchịchị mmiri. (Ekliziastis 4:1; 8:9) Ma, Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile kwuru na ya ga-eweta ọchịchị ga-anọchi ọchịchị ndị ọzọ niile. Onye ga-achịwa mgbe ahụ ga-emete onye ọ bụla mma.—Gụọ Aịzaya 11:4; Daniel 2:44.

Gịnị ka Alaeze Chineke ga-emere anyị?

Jehova Chineke ahọpụtala onye ruru eru ịchị ụwa niile. Ọ bụ Ọkpara ya bụ́ Jizọs. (Luk 1:31-33) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nyeere ndị mmadụ aka. Ya chịwa ụwa a, ọ ga-eme ka mba niile dịrị n’otu, meekwa ka ụmụ mmadụ kwụsị ịta ahụhụ.—Gụọ Abụ Ọma 72:8, 12-14.

Ọ̀ bụ mmadụ niile chọrọ ka Jizọs bụrụ Eze ha? Mba. Ma, Jehova na-enwere ha ndidi. (2 Pita 3:9) Ọ na-enye ndị mmadụ oge ka ha kpebie ma hà chọrọ ka Jizọs chịwa ha ma ọ bụ na ha achọghị. Ọ gaghị ete aka ugbu a Jizọs alaa ndị ọjọọ niile n’iyi ma mee ka udo dịrị n’ụwa niile, obi eruokwa mmadụ niile ala.—Gụọ Maịka 4:3, 4.