Gaa n'Isiokwu

Olee Otú E Si Hazie Ọgbakọ Ndịàmà Jehova?

Olee Otú E Si Hazie Ọgbakọ Ndịàmà Jehova?

 E nwere ndị a na-akpọ ndị okenye n’ọgbakọ anyị. Ọ bụ ha na-ahụ maka otú ihe si aga n’ọgbakọ ọ bụla. A na-ejikọta ihe dị ka ọgbakọ iri abụọ, ha aghọọ otu sekit. E nwere ndị okenye na-aga eleta ọgbakọ dị iche iche. A na-akpọ ha ndị nlekọta sekit.

 O nwere ndị anyị na-akpọ Òtù Na-achị Isi. Ha bụ ndị nọterela aka n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Ọ bụ hanwa na-esi na Baịbụl ewepụta ihe a na-akụziri Ndịàmà Jehova niile. Ha nọ n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Wọwik nke dị na Niu Yọk, dị n’Amerịka—Ọrụ Ndịozi 15:23-29; 1 Timoti 3:1-7.