Gaa n'Isiokwu

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Akpọ Ebe Ha Na-anọ Amụ Ihe Chọọchị?

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Akpọ Ebe Ha Na-anọ Amụ Ihe Chọọchị?

 Na Baịbụl, okwu Grik a na-asụgharị “chọọchị” mgbe ụfọdụ pụtara ndị gbakọtara ọnụ na-efe ofufe, ọ bụghị ebe ha nọ na-efe ofufe.

 Dị ka ihe atụ: Mgbe Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ, o kelere di na nwunye a na-akpọ Akwịla na Prisila ma gwa ha ka ha ‘kelekwaa chọch nke dị n’ụlọ ha.’ (Ndị Rom 16:5, Bible Nsọ Ọhụụ) Ihe Pọl na-ekwu abụghị ka ha kelee ụlọ ha. Kama, ihe ọ na-ekwu bụ ka ha kelee ndị na-ezukọ n’ụlọ ha. a

 N’ihi ya, kama ịkpọ ebe anyị na-anọ amụ ihe chọọchị, anyị na-akpọ ya “Ụlọ Nzukọ Alaeze.”

Gịnị mere unu ji akpọ ya “Ụlọ Nzukọ Alaeze”?

 Aha a dabara adaba n’ihi ihe ndị a:

  •   Ọ bụ ebe ndị mmadụ na-ezukọ.

  •   Anyị na-agbakọta ebe ahụ efe Jehova Chineke, onye e dere okwu ya na Baịbụl, na-anọkwa ebe ahụ ahazi otú anyị si ekwusa ozi Alaeze Chineke.​—Abụ Ọma 83:18; Aịzaya 43:12.

  •   Anyị na-anọ ebe ahụ amụ banyere Alaeze Chineke, nke Jizọs kwuru okwu ya ọtụtụ ugboro.​—Matiu 6:9, 10; 24:14; Luk 4:43.

 Biko gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị dị gị nso ma jiri anya gị hụ otú Ndịàmà Jehova si amụ ihe.

a Lee ebe ndị ọzọ gosiri na chọọchị pụtara ndị mmadụ: 1 Ndị Kọrịnt 16:19; Ndị Kọlọsi 4:15; na Faịlimọn 2.