Gaa n'Isiokwu

Ọ̀ Bụ Ekwensu Na-akpata Nsogbu Niile?

Ọ̀ Bụ Ekwensu Na-akpata Nsogbu Niile?

Ihe Baịbụl kwuru

 Baịbụl kwuru na Ekwensu dị adị. Ọ dị ka onye omekome obi tara mmiri. Ọ na-eme “ihe ịrịba àmà ụgha,” na-eduhiekwa ndị mmadụ. Baịbụl kwudịrị na ‘ọ na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè.’ (2 Ndị Tesalonaịka 2:9, 10; 2 Ndị Kọrịnt 11:14) Ihe nwere ike inyere mmadụ aka ịma na e nwere onye bụ́ Ekwensu bụ arụ dị iche iche ọ na-akpa.

 Ma, ọ bụghị Ekwensu na-akpata nsogbu niile na-abịara anyị. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Chineke kere ndị mmadụ otú ha ga-enwe ike ịhọrọ ma hà ga-eme ihe ọma ka ọ̀ bụ ihe ọjọọ. (Jọshụa 24:15) Ọ bụrụ na anyị ekpebie ime ihe ọjọọ, anyị ga-ata ahụhụ ya.—Ndị Galeshia 6:7, 8.