Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊ NA CHINEKE NWERE IKE ỊDỊ NÁ MMA

Ị̀ Ma Aha Chineke? Ị̀ Na-akpọkwa Ya Aha Ahụ?

Ị̀ Ma Aha Chineke? Ị̀ Na-akpọkwa Ya Aha Ahụ?

Ò nwere ezigbo enyi gị ị na-amaghị aha ya? Ọ dịghị ka o nwere. Otu nwaanyị onye Bọlgeria aha ya bụ Irina kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ amaghị aha Chineke, ya na Chineke enweghị ike ịdị ná mma.” Ihe a o kwuru bụ eziokwu. Isiokwu bu nke a ụzọ gosiri na Chineke chọrọ ka ị bịa ya nso. Ọ bụ ya mere o ji si na Baịbụl na-agwa gị onye ọ bụ. Ọ sịrị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m.”—Aịzaya 42:8.

Chineke si na Baịbụl na-agwa gị onye ọ bụ. Ọ sịrị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m.”—Aịzaya 42:8

Jehova ọ̀ chọrọ ka ị mara aha ya ma na-akpọ ya aha ahụ? Chegodị echiche. E dere mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ bụ́ aha Chineke ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ugboro puku asaa n’Akwụkwọ Nsọ Hibru n’oge a na-ede Baịbụl. E nweghị aha ọzọ e dere ọtụtụ ugboro na Baịbụl ka aha Chineke. N’eziokwu, otú a e si dee aha Chineke ọtụtụ ugboro na Baịbụl gosiri na Jehova chọrọ ka anyị mara aha ya ma na-akpọ ya aha ahụ. *

Mmadu abụọ chọrọ ịbụ enyi na-ebu ụzọ amata aha ibe ha. Ị̀ ma aha Chineke?

Ma, ụfọdụ ndị nwere ike iche na ebe Chineke dị nsọ ma bụrụ onye pụrụ ime ihe niile, ịkpọ ya aha ya bụ ịkparị ya akparị. N’eziokwu, anyị ekwesịghị iji aha Chineke egwuri egwu otú ahụ anyị na-agaghị eji aha ezigbo enyi anyị egwu egwu. Jehova chọrọ ka ndị hụrụ ya n’anya na-akwanyere aha ya ùgwù ma mee ka ndị mmadụ mara ya. (Abụ Ọma 69:30, 31; 96:2, 8) Chetakwa na Jizọs kụziiri ndị na-eso uzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” Anyị ga-eso na-eme ka e doo aha Chineke nsọ ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ka ndị mmadụ mara aha ahụ. Ọ bụrụ na anyị ana-eme nke a, anyị na Chineke ga-adị ná mma.—Matiu 6:9.

Baịbụl gosiri na Jehova Chineke ejighị “ndị na-echebara aha ya echiche” ma ọ bụ ndị ji aha ya kpọrọ ihe egwu egwu. (Malakai 3:16) O kwere onye ọ bụla na-echebara aha ya echiche nkwa, sị: “M ga-echebe ya n’ihi na ọ matawo aha m. Ọ ga-akpọku m, m ga-azakwa ya. M ga-anọnyere ya n’oge ahụhụ.” (Abụ Ọma 91:14, 15) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Jehova dịrị n’ezigbo mma, anyị ga-ama aha ya ma na-akpọ ya aha ahụ.

^ para. 4 Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị nsụgharị edeghị aha Chineke na Baịbụl ndị ha sụgharịrị n’agbanyeghị na aha Chineke gbara ọtụtụ ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, nke ọtụtụ ndị na-akpọ Agba Ochie. Ha dere utu aha bụ́ “Onyenwe anyị” ma ọ bụ “Chineke” n’ebe ha kwesịrị ide aha nsọ Chineke. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu gbasara aha Chineke, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 195-197. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.