Gaa n'Isiokwu

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Ji Kpebie na Ha Agaghị Eso Na-eme Ihe Ndị E Ji Eto Mba?

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Ji Kpebie na Ha Agaghị Eso Na-eme Ihe Ndị E Ji Eto Mba?

 Ndịàmà Jehova na-erubere ndị ọchịchị isi, na-akwanyekwara ihe ndị na-anọchite anya mba ha ùgwù. Anyị ma na ndị ọzọ nweere onwe ha igbuchapụrụ ọkọlọtọ, ikwe ukwe e ji eto mba, ma ọ bụ ikwu na ha ga-eji ndụ ha jeere mba ha ozi.

 Ma, Ndịàmà Jehova kpebiri na ha agaghị eso eme ihe ndị ahụ n’ihi na anyị kweere na ha adabaghị n’ihe Baịbụl na-akụzi. Ọ na-amasị anyị ma ndị mmadụ kwanyere anyị ùgwù n’agbanyeghị ihe anyị kweere otú ahụ anyịnwa sikwa akwanyere ndị ọzọ ùgwù n’agbanyeghị ihe ha kweere.

Ajụjụ ndị a zara n’isiokwu a

 Gịnị ka Baịbụl kwuru n’okwu a?

 Ihe abụọ Baịbụl kwuru anyị ga-eleba anya na ha ugbu a na-enyere anyị aka ikpebi ihe anyị ga-eme:

  •   Ọ bụ naanị Chineke ka anyị kwesịrị ife ofufe. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka i kwesịrị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka i kwesịrị ijere ozi.” (Luk 4:8) Ndị mmadụ kwuwe na ha ga-eji ndụ ha jeere mba ha ozi ma ọ bụ kwewe ukwe e ji eto mba, ha na-ekwu ihe ndị gosiri na ha ga-ahụ mba ha n’anya karịa ihe ọ bụla ọzọ. N’ihi ya, Ndịàmà Jehova chere na ọ dịghị mma ka ha soro na-eme ihe ndị a.

     Ndịàmà Jehova chekwara na igbuchapụrụ ọkọlọtọ bụ ife ya ofufe, ma ọ bụ ikpere arụsị. Baịbụl kwukwaranụ na ikpere arụsị adịghị mma. (1 Ndị Kọrịnt 10:14) Ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwetara na ndị mmadụ na-efe ọkọlọtọ ofufe. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Carlton J. H. Hayes dere, sị: “Ndị hụrụ mba ha n’anya dị ka ndị na-ekpe okpukpe. Ihe na-anọchi anya okpukpe ha bụ ọkọlọtọ. Ọ bụkwa ya ka ha na-efe ofufe.” a Mgbe otu onye na-ede akwụkwọ aha ya bụ Daniel P. Mannixs na-ekwu banyere ndị mbụ soro ụzọ Kraịst, ọ sịrị: “Ndị Kraịst jụrụ . . . ịchụrụ ihe oyiyi eze ukwu [Rom] àjà. E nwere ike iji ihe a ha mere tụnyere mmadụ ịjụ igbuchapụrụ ọkọlọtọ n’oge anyị a.” b

    Ọ bụ eziokwu na Ndịàmà Jehova anaghị egbuchapụrụ ọkọlọtọ, ma anyị anaghị ekotu ya, agba ya ọkụ, ma ọ bụ eme ya ihe ọ bụla ga-egosi na anyị anaghị akwanyere ya ùgwù. Anyị anaghịkwa emebisị ihe ọ bụla ọzọ na-anọchi anya mba.

  •   Mmadụ niile hà otu n’anya Chineke. (Ọrụ Ndịozi 10:34, 35) Baịbụl kwuru na Chineke ‘si n’otu mmadụ mee ka mmadụ niile nọ ná mba ọ bụla dịrị.’ (Ọrụ Ndịozi 17:26) N’ihi ihe a Baịbụl kwuru, Ndịàmà Jehova kweere na ọ dịghị mma iwere ya na otu agbụrụ ma ọ bụ otu mba ka ndị ọzọ mma. Anyị na-akwanyere ndị ọ bụla ùgwù n’agbanyeghị ebe ha si ma ọ bụ ebe ha bi.​—1 Pita 2:17.

 Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na iwu kwuru na mmadụ niile ga-esorịrị mee ihe ndị ahụ?

 Ndịàmà Jehova anaghị agba ọchịchị mgba okpuru. Anyị kweere na ọchịchị so ‘n’ihe Chineke haziri’ ma kwe ka ọ dịrị. (Ndị Rom 13:​1-7) Anyị kwekwaara na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-erubere ndị ọchịchị isi.​—Luk 20:25.

 Ma, gịnị ka anyị na-eme ma ndị ọchịchị gwa anyị mee ihe Chineke sịrị anyị emela? Mgbe ụfọdụ, ọ na-adịrị anyị mfe idegara ndị ọchịchị akwụkwọ rịọ ha ka ha gbanwetụ ihe n’ihe ha chọrọ ka anyị mee. c Ma ọ bụrụ na ha ekweghị, Ndịàmà Jehova na-ahọrọ ‘irubere Chineke isi karịa mmadụ.’​—Ọrụ Ndịozi 5:29.

 Ndịàmà Jehova hà chọrọ ka ọ bụrụ ihe ha kwuru ka a ga na-eme n’obodo ma ọ bụ n’ọchịchị?

 Mba. Ndịàmà Jehova anaghị akwado òtù ọ bụla chọrọ ka obodo mewe ihe ha na-ekwu ma ọ bụ òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ihe mere na anyị anaghị ekwe ukwe e ji eto mba, egbuchapụrụ ọkọlọtọ, ma ọ bụ ekwu na anyị ga-eji ndụ anyị jeere mba anyị ozi abụghị maka na ihe ndị ọchịchị na-eme na-ewe anyị iwe. Kama, ọ bụ maka na anyị na-erube isi n’ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe ndị ahụ.

a Essays on Nationalism, peeji nke 107-108.

b The Way of the Gladiator, peeji nke 212.