Egwú

Gere ọmarịcha egwú ndị anyị ji ekele Chineke n’ihi na o mere ka anyị bụrụ Ndị Kraịst.

Ndụ Kacha Mma

Anyị ga-enwta obi ụtọ ma anyị na-enyere ndị ọzọ aka ma na-agba ha ume.

Obi Ụtọ A Na-enwe ná Mgbakọ

Mgbe ọ bụla anyi gara mgbakọ, anyị na-ahụ ịdị n’otu na ịhụnanya ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile nwere, ọ na-emetụkwa anyi n’ahụ.

Ihe Kacha Mma M Nwere

Ọ naghị adịrị ndị nne na nna mfe ma ụmụ ha kwaga ebe dị anya iji jekwuoro Jehova ozi.

Leruo Anya, Họrọ Ọfụma

Anyị chọwa onye anyị ga-alụ, anyị kwesịrị iji ndidi lezie anya ma họrọ onye anyị ga-alụ.

Chetụgodi Oge Ahụ

Ndụ ọhụrụ n’ime ụwa ọhụrụ bụ ọdịnihu na-echere anyị n’isi nso.

Na-eso Ya

Na-eso ọgbakọ Jehova na-aga n’ihu

Ịmụta Asụsụ Ọzọ

Kedụ ngọzị ndị anyị ga-nweta ma anyi mụọ asụsụ ọzọ?

Jiri Nwayọọ

Ozi anyị na ihe ndị ọzọ anyị n’eme na ndụ ga-aka mma ma anyị wetuo obi jiri nwayọọ mee ha ọfụma.

Na-egosi Ịhụnanya

Kedụ ụzọ ndị ọzọ i nwere ike isi na-ele ndị ọzọ ọbịa?

Anyị Na-Ekele Gị

Chineke na-enye anyị mmụọ nsọ ya iji nyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị. Ọ na-eme ka anyị jiri obi ụtọ na-abụku ya abụ iji kelee ya, n’ihi na anyị ma na ọ gaghị ahapụ ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ.

Ebe M kwụ

Olee otú ị ga-esi emeta ezigbo ndị enyi?

Ihe M Kpebiri Ime

Ọ ga-adị mma ma anyị chee echiche gbasara otú ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị si emetụta ozi anyị na ndị ọzọ.

Na-agbagharanụ

Na-achọ ụzọ ị ga-esi na-eṅomi Jehova ma na-agbaghara ndị ọzọ na ndụ gị.

N’egbughị Oge Ọ Bụla

Ịna-atụ anya ihe ọma ndị ga-eme na Paradaịs ga-enyere anyị aka idi nsogbu.

Ịmụ Ihe Ga-Eme Ka I Sie Ike

Ịmụ Okwu Chineke ga-enyere ndi na-eto eto aka ka okwukwe ha sie ike.

Okwu Gị Na-adị Ebighị Ebi

Na-ekele Chineke maka okwu ya o chebeere anyị.

Wetuo Obi, Kpee Ekpere

Mgbe anyị nọ na nsogbu, gini ka anyị ga-eme?

Ekpebigo M Ime Ihe dị Jehova Mma Mgbe Dum

Ime mkpebi ndị ga-adị Jehova mma mgbe niile.

Okwukwe Ga-agbanweli Ihe

Inwe okwukwe siri ike chọrọ ezigbo mgbalị, ma Jehova ga-agọzi anyị ma anyị mee mgbalị ahụ.

M Na-edebe Iwu Gị

Anyị ga-agbalị mee ka okwu anyị na omume anyị na-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya n’eziokwu.

Ezigbo Ndị Enyi

Olee ebe anyị ga-esi nweta ezigbo ndị enyi?

M Ga-akwado Gị

Otú ọ bụla ihe si dịrị anyị, anyị nwere ike ịtụkwasị ezigbo enyi anyị obi.

Anyị Bụ Ndị Jehova

N’agbanyeghị na anyị bi n’ụwa ọjọọ, anyị na ụmụnna anyị dị n’udo ma dịrị n’otu.

Nye M Obi Ike

Jehova ga-enyeli anyị obi ike anyị ga-eji die nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara anyị.

M Ga-enye Gị Ihe Niile

Anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-ejere Jehova ozi.

Echegbula Onwe Gị Maka Echi

Anyị ga-enweli udo na obi ụtọ n’agbanyeghị nsogbu.

Nwee Obi Ike, Dịkwa Ike

Ihe a bụ ọmarịcha abụ na-enyere anyị aka ịna-edi nsogbu.

Ikele Chineke Maka Ihe Ndị O Kere

Wepụta oge chebara ihe ndị Jehova kere echiche ma kelee ya maka ha.

Anyị Bụ Otu Ezinụlọ

N’agbanyeghị ebe anyị nọ, anyị so n’ezinụlọ Jehova.

“Lụọ Ezi Ọgụ nke Okwukwe”

N’agbanyeghị nsogbu ndị anyị na-enwe, anyị ka nwere ike ịnọgide na-efe Jehova.

Jehova Ga-elekọta Anyị

Jehova chọsiri ike ịna-edu anyị na-aga.

Alaeze Chineke Na-abịa

Ihe anyị na-atụgharị n’uche nwere ike ime ka obi na-adị anyị mma. Egwú a ga-enyere anyị aka ilekwasị anya n’ụwa ọhụrụ.

M Na-enyefe Gị Ndụ M

N’ihi ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ, anyị na-enyefe ya onwe anyị ma mee baptizim.

Ịhụnanya Adịghị Ada Ada

Ịhụnanya Jehova adịghị ada ada. Ọ na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ, na-akasikwa anyị obi.

Kọsara Ya Nsogbu Gị

Ọ bụrụ na o nwere ihe mere ka ị daa mbà, tụkwasị Jehova obi. Ọ ga-enye gị ike ma kasie gị obi.

Dịrị Ka Nwata

Olee otú anyị ga-esi dịrị ka nwata ma a bịa n’igosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya?

Na-agbaghara Kpamkpam

Ò nwere onye mejọrọ gị? Ọ̀ na-esiri gị ike ịgbaghara ya? Gee egwú a ka ị mata otú ị ga-esi gbaghara ya kpamkpam.

Na-agba Ọsọ Ndụ

Mee mkpebi ndị dị mma ka i nwee ike imeri n’ọsọ ndụ.

Anyị Ga-eme Ka Okwukwe Anyị Na-esikwu Ike

Ọ bụ ihe ndị anyị mụtara n’Okwu Chineke ka anyị ga-eji eme ka okwukwe anyị sie ike.

Ịhụnanya M

Alụmdi na nwunye bụ onyinye si n’aka Jehova. Na-enwe obi ụtọ maka ya.

Chebe Obi Gị

Jehova ga-enyere gị aka ịkwụsị ịna-echegbu onwe gị.

‘Na-aṅụrị Ọṅụ’

Egwú a na-atọ ụtọ ga-eme ka anyị cheta ihe ndị mere anyị kwesịrị iji na-aṅụrị ọṅụ.

Ndị Jehova Dị n’Otu

N’agbanyeghị ọnwụnwa na mkpagbu, anyị niile ka dị n’otu.

Jiri Ike Gị Na-efe Jehova

Jiri ike gị na-efe Jehova. Ị gaghị akwa mmakwaara. Jehova ga-agọzi gị.

Ọ Bụ Gị Bụ Ọṅụ Anyị Ruo Ebighị Ebi

Ọ bụ Jehova na-enye anyị ọṅụ. Ọ ga-anọgidekwa na-enye anyị ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi.

Ka Anyị Banye na Paradaịs

Egwú a ga-eme ka ị na-enwe obi ụtọ maka ihe ọma ndị Jehova ga-emere anyị n’ụwa ọhụrụ.

Na-echeta Jehova

Ime ọtụtụ ihe n’ozi Jehova bụ ihe kacha mma anyị nwere ike iji ndụ anyị eme.

Nwee Okwukwe

Were ya na ị na-ahụ ụwa ọhụrụ Chineke kwere ụmụ mmadụ ná nkwa.

Ezinụlọ Jehova

A ka nwere ndị na-achọ ịmata eziokwu Baịbụl n’ụwa taa. Vidio egwú a ga-enyere gị aka ịnọgide na-achọ ndị a yiri atụrụ.

Anyị Ga-adị Ike ma Anyị Dị n’Otu

N’enyemaka Jehova nakwa nke ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile, anyị ga-edili ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị.

Ònye Ka M Ga-alakwuru?

Lee vidio egwú a ka ị hụ ihe dị iche iche otu nwoke na-efe Chineke na-eme iji gosi na ọ na-ege ntị n’olu Jizọs.

Ama M na Jehova Na-edu M

N’enyemaka Jehova, anyị ga-emerili ihe ọ bụla na-eme ka ụjọ na-atụ anyị.

Ka Anyị Kpezie, Bụrụkwa Enyi

Chefuo ihe enyi gị mere gị na-ewe gị iwe. Kpezienụ ma bụrụkwa enyi.

Si n’Ihe I Mejọrọ Mụta Ihe

Ọ bụrụ na i si n’ihe i mejọrọ mụta ihe, ọ ga-eme ka ị dịrị ike karịa otú ị dị na mbụ.

Jisie Ike Ka I Nweta Ndụ Ebighị Ebi

Ndụ anyị ga-enweli isi, anyị ana-enwekwa ezigbo obi ụtọ ma ugbu a ma n’ọdịnihu.

Udo Ga-emecha Dị (Abụ Mgbakọ Ukwu Afọ 2022)

N’agbanyeghị nsogbu ndị ị na-enwe, gbalịa na-echeta na Chineke kwere nkwa na ezigbo udo ga-emecha dị.

Bịaruo M Nso

Chineke ji ndị niile na-achọ ịbịaru ya nso kpọrọ ihe n’agbanyeghị otú ihe si dịrị ha.

Ọ Gaghị Egbu Oge (Abụ Mgbakọ Ukwu Afọ 2023)

Na-eṅomi ndị na-eme nke ọma n’ofufe Jehova ma jiri ndidi na-echere ụbọchị Jehova.

Biko, Lọta

Echekwala na i nweghịzi ike ịlọghachikwute Jehova.

“Obere Mkpụrụ Ego Abụọ”

Onyinye ndị ị na-enye na-eme Jehova obi ụtọ n’agbanyeghị otú ha hà.

Ọ Ma Anyị

Jehova maara onye nke ọ bụla n’ime anyị, ọ na-aghọtakwa otú obi dị anyị.

Mgbe Mmadụ Niile Ga Na-eto Jehova

Anyị na ụmụnna anyị dị n’udo n’ihi na anyị niile na-efe Jehova.

Na-ekwusa Ya

Tụkwasị Jehova obi, nọgidekwa na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na ụjọ nwere ike ịtụtụ gị mgbe ụfọdụ.

Udo Ya Dị Ka Osimiri

Udo Jehova na-enye dị ka osimiri, ọ na-adịkwa ruo ebighị ebi.

“Ozi Ọma” (Abụ Mgbakọ Ukwu Afọ 2024)

Kemgbe ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga ruo taa, ndị mmadụ ji ọṅụ na-ekwusa ozi ọma. Ikwusa ozi ọma a dị ezigbote mkpa. Ọ bụkwa Jizọs n’onwe ya na ndị mmụọ ozi na-eduzi ọrụ a.