Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nkwurịta okwu dị ka àkwà mmiri ga-enyere gị aka ịbịa ụmụ gị nso, marakwa obi ha

MAKA NDỊ NNE NA NNA

5: Gị na Ụmụ Gị Na-ekwurịta Okwu

5: Gị na Ụmụ Gị Na-ekwurịta Okwu

IHE Ọ PỤTARA

A ga-asị na gị na ụmụ gị na-ekwurịta okwu nke ọma ma ọ bụrụ na unu ana-agwa ibe unu otú obi dị unu na ihe unu na-eche.

IHE MERE O JI DỊ MKPA

O nwere ike isi ike gị na ụmụ gị ịna-ekwurịta okwu nke ọma, karịchaa mgbe ha nọ n’agbata afọ iri na atọ na afọ iri na itoolu. Otu akwụkwọ aha ya bụ Breaking the Code kwuru na mgbe ụmụaka dị obere, ha na-agwa ndị mụrụ ha ihe niile. Ma ha tolitewe, ha anaghịzi achọ ịgwa ndị mụrụ ha ihe ha na-eche na otú obi dị ha, ya emee ka o siere ha ike ịmata obi ụmụ ha. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ n’oge ahụ ka ọ kacha dị mkpa ka gị na ha na-ekwurịta okwu, n’agbanyeghị na o nwere ike ịdị ka ha achọghị ya.

IHE I NWERE IKE IME

Dị njikere gị na nwa gị ikwurịta okwu mgbe ọ bụla ọ chọrọ. Dị njikere gị na ya ikwurịta, ọ bụrụgodị n’ime abalị.

Otu nwaanyị aha ya bụ Lisa kwuru, sị: “O nwere ike ịdị gị ka gị sị nwa gị, ‘Ọ̀ bụ ugbu a ka ị chọrọ ikwu okwu? Ọ̀ kwa mụ na gị nọ kemgbe taa?’ Ma, anyị ekwesịghị iwewa iwe ma nwa anyị chọọ ịgwa anyị otú obi dị ya. Ọ́ bụghị ihe onye ọ bụla mụrụ nwa na-achọ achọ?”

Otu nwoke aha ya bụ Herbert kwuru, sị: “Anaghị m eji ụra abalị m egwu egwu, ma otu n’ime oge mụ na ụmụ m ndị na-eto eto kacha kwurịta okwu otú dị mma bụ n’ime abalị.”

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ka onye ọ bụla na-achọ ihe ga-abara onye ọzọ uru, ọ bụghị ihe ga-abara naanị yanwa uru.”—1 Ndị Kọrịnt 10:24.

Ekwela ka ihe ọ bụla na-adọpụ gị uche mgbe nwa gị na-agwa gị okwu. Otu nwoke kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, m na-achọpụta na ihe ndị ọzọ na-adọpụ m uche mgbe ụmụ m na-agwa m okwu. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ha na-amata na uche m dị ebe ọzọ.”

Ọ bụrụ na ị chọpụta na tiivi ma ọ bụ ekwentị gị na-adọpụ gị uche ma nwa gị na-agwa gị okwu, gbanyụọ ya ma ọ bụ dowe ya otú ọ na-agaghị adọpụ gị uche. Gee nwa gị ntị nke ọma, jirikwa ihe ọ na-ekwu kpọrọ ihe, ọ bụrụgodị na ọ dị gị ka ihe na-abachaghị uru.”

Otu nwaanyị aha ya bụ Maranda kwuru, sị: “Anyị kwesịrị ime ka ụmụ anyị ghọta na anyị chọrọ ịma otú obi dị ha. Ma ọ́ bụghị ya, ha agaghị agwa anyị obi ha ma ọ bụkwanụ ha achọọ onye ọzọ ha ga-agwa ya.”

Otu nwoke aha ya bụ Anthony kwuru, sị: “Ewesokwala nwa gị iwe, ọ bụrụgodị na ihe o kwuru adịghị mma.”

IHE BAỊBỤL KWURU: “Na-egenụ ntị nke ọma.”—Luk 8:18.

Gị na ụmụ gị na-ekwurịta okwu mgbe unu na-eme ihe dịịrị unu n’ụbọchị. Mgbe ụfọdụ, ụmụaka na-aka ekwu obi ha ma ọ bụrụ na ha na ndị mụrụ ha anọdụghị ala ihu n’ihu na-ekwurịta okwu.

Otu nwoke aha ya bụ Nicole kwuru, sị: “Mụ na nwunye m na ụmụ anyị na-eji oge anyị nọ n’ụgbọala na-aga ihe ekwurịta okwu. Ebe ọ bụ na anyị anaghị ele onwe anyị anya ihu n’ihu, ọ na-eme ka ha tụsara ahụ́ gwa anyị okwu.”

Oge e ji eri nri bụ oge ọzọ dị mma nne na nna na ụmụ ha nwere ike ikwurịta okwu.

Otu nwoke aha ya bụ Robin kwuru, sị: “Anyị riwe nri abalị, onye ọ bụla na-ekwu nsogbu o nwere n’ụbọchị ahụ na ihe meere ya. Ihe a na-eme ka anyị dị n’otu, na-emekwa ka onye ọ bụla n’ime anyị mara na ndị ọzọ ga-enyere ya aka ma o nwee nsogbu.”

IHE BAỊBỤL KWURU: ‘Bụrụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-anaghị ekwu okwu ngwa ngwa.’—Jems 1:19.