Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Di na nwunye ịna-agwa ibe ha okwu otú gosiri na ha na-akwanyere ibe ha ùgwù ga-eme ka alụmdi na nwunye ha sie ike otú ahụ simenti si ejidesi blọk ike

MAKA NDỊ DI NA NWUNYE

3: Na-akwanyerenụ Ibe Unu Ùgwù

3: Na-akwanyerenụ Ibe Unu Ùgwù

IHE Ọ PỤTARA

Di na nwunye na-akwanyere ibe ha ùgwù na-ahụ ibe ha n’anya, ma mgbe ha nwere esemokwu. Otu akwụkwọ aha ya bụ Ten Lessons to Transform Your Marriage kwuru, sị: “Onye nke ọ bụla n’ime ha anaghị esi ọnwụ na a ga-emerịrị ihe ọ chọrọ. Kama ha nwee esemokwu, ha na-ekwurịta banyere ya. Ha na-ege ibe ha ntị nke ọma, na-achọpụtakwa otú ha ga-esi dozie nsogbu ahụ.”

IHE BAỊBỤL KWURU: ‘Ihụnanya anaghị achọ ihe ga-abara naanị ya uru.’—1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5.

Otu nwoke aha ya bụ Micah kwuru, sị: “M na-akwanyere nwunye m ùgwù ma ọ bụrụ na mụ aghara ịna-eme ihe ọ bụla ga-egbu mmụọ ya ma ọ bụ ihe ọ bụla ga-eme ka anyị tisaa.”

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Ọ bụrụ na di na nwunye anaghị akwanyere ibe ha ùgwù, ha ga na-akparị ibe ha, na-ama onwe ha njakịrị, na-eledakwa ibe ha anya. Ihe ndị a bụ àgwà ndị ọkachamara kwuru na-eduga n’ịgba alụkwaghịm.

Otu nwoke aha ya bụ Brian kwuru, sị: “Iji akọ na-agwa nwunye gị okwu ọjọọ ma ọ bụ na-ama ya njakịrị ga-eme ka o lewa onwe ya anya ka o nweghị uru ọ bara, meekwa ka ọ gharazie ịtụkwasị gị obi. Ọ ga-emebikwara gị ihe n’alụmdi na nwunye unu.”

IHE I NWERE IKE IME

CHEBARA IHE NDỊ A ECHICHE

Jiri otu izu lee otú i si gwa di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu na otú i si meso ya ihe. Jụzie onwe gị, sị:

  • ‘Ugboro ole ka m katọrọ di m ma ọ bụ nwunye m, ugboro olekwa ka m jara ya mma?’

  • ‘Olee otú m si kwanyere ya ùgwù?’

GỊ NA DI GỊ MA Ọ BỤ NWUNYE GỊ ZAA AJỤJỤ NDỊ A

  • Olee ihe ndị ị ga-ekwu ma ọ bụ mee, ya adị di gị ma ọ bụ nwunye gị ka ị̀ na-akwanyere ya ùgwù?

  • Olee ihe ndị ị ga-ekwu ma ọ bụ mee, ya adị di gị ma ọ bụ nwunye gị ka ị̀ kparịrị ya?

IHE NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA

  • Depụta ihe atọ ị ga-achọ ka di gị ma ọ bụ nwunye gị na-eme iji gosi na ọ na-akwanyere gị ùgwù. Gwakwa ya ka o dee nke ya. Nye ya nke gị, natakwa ya nke ya. Bidokwanụ ime ihe onye ọ bụla dere.

  • Depụta àgwà ọma ndị di gị ma ọ bụ nwunye gị nwere. Gwazie ya otú àgwà ya ndị ahụ si amasị gị.

Otu nwaanyị aha ya bụ Megan kwuru, sị: “M ga-asị na m na-akwanyere di m ùgwù ma ọ bụrụ na m ji ya kpọrọ ihe, ma na-agbalị ime ya obi ụtọ. Ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-abụ nnukwu ihe, obere ihe m mere ma ọ bụ kwuo nwere ike igosi ya na m na-akwanyere ya ùgwù.”

Ihe dị mkpa abụghị gịnwa iche na ị na-akwanyere di gị ma ọ bụ nwunye gị ùgwù, kama ọ bụ ma ò chere na ị na-akwanyere ya ùgwù n’eziokwu.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Yirinụ àgwà ndị a ka uwe: obi ebere, obiọma, obi umeala, ịdị nwayọọ, na ndidi.”—Ndị Kọlọsi 3: 12.