Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbaghara nwere ike ime ka esemokwu nyụọ ka ọkụ

MAKA NDỊ DI NA NWUNYE

4: Na-agbagharanụ Ibe Unu

4: Na-agbagharanụ Ibe Unu

IHE Ọ PỤTARA

Mgbaghara pụtara ileghara mmejọ anya ma ghara iburu onye mejọrọ gị iwe n’obi. Ọ pụtaghị ime ka ihe e mere gị adịghị njọ ma ọ bụ mee ka o nweghị ihe merenụ.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Na-edirinụ ibe unu ihe, na-agbagharakwanụ ibe unu kpamkpam ma e nwee onye ibe ya mejọrọ.”—Ndị Kọlọsi 3:13.

Otu nwoke aha ya bụ Aaron kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị hụrụ mmadụ n’anya, ị gaghị na-elekwasị anya n’ihe onye ahụ na-anaghị emeta, kama, ị ga na-achọ ịhụ mgbalị ọ na-eme ime ihe dị mma.”

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Ọ bụrụ na ị na-ebu iwe n’obi, i nwere ike ịkpatara onwe gị ọrịa, obi agaghịkwa na-eru gị ala. O nwekwara ike ime ka alụmdi na nwunye unu tisaa.

Otu nwaanyị aha ya bụ Julia kwuru, sị: “O nwere otu oge di m rịọrọ m mgbaghara maka ihe o mere wutere m. O siiri m ike ịgbaghara ya. Emechara m gbaghara ya, ma o wutere m na emeghị m ya ngwa ngwa. Ihe a kpara adịm ná mma anyị aka ọjọọ.”

IHE I NWERE IKE IME

CHEBARA IHE NDỊ A ECHICHE

Oge ọzọ di gị ma ọ bụ nwunye gị kwuru ma ọ bụ mee ihe wutere gị, jụọ onwe gị, sị:

  • ‘Ihe a ò kwesịrị iwe m iwe?’

  • ‘Ihe a o mere m ò ruru ihe m ga-achọwa ka ọ rịọ m mgbaghara ka ọ̀ bụ ihe m ga-eleghara anya?’

GỊ NA DI GỊ MA Ọ BỤ NWUNYE GỊ ZAA AJỤJỤ NDỊ A

  • Ọ̀ na-ewekarị anyị oge ịgbaghara ibe anyị?

  • Olee ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-agbaghara ibe anyị ngwa ngwa?

IHE NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA

  • Di gị ma ọ bụ nwunye gị mee ihe wutere gị, echela na o bu ihe ọjọọ n’obi mee ya.

  • Gbalịa gbaghara di gị ma ọ bụ nwunye gị, ebe ọ bụ na “anyị niile na-emejọ ihe ọtụtụ ugboro.”—Jems 3:2.

Otu nwaanyị aha ya bụ Kimberly kwuru, sị: “Ọ na-adịrị anyị mfe ịgbaghara ibe anyị ma ọ bụrụ anyị abụọ mejọchara ibe anyị, ma ọ na-esi ike ma ọ bụrụ na o yie ka ọ̀ bụ naanị otu onye mejọrọ. Anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi iji nabata arịrịọ a rịọrọ anyị ma gbaghara.”

IHE BAỊBỤL KWURU: “Dozie okwu ọsọ ọsọ.”—Matiu 5:25.

Ọ bụrụ na ị na-ebu iwe n’obi, i nwere ike ịkpatara onwe gị ọrịa, obi agaghịkwa na-eru gị ala. O nwekwara ike ime ka alụmdi na nwunye unu tisaa