Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikpebi na ị gaghị ahapụ di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-eme ka alụmdi na nwunye unu sie ike otú ahụ arịlịka si ejidesi ụgbọ mmiri ike mgbe ebili mmiri na-eme

MAKA NDỊ DI NA NWUNYE

1: Kpebie Na Ị Gaghị Ahapụ Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị

1: Kpebie Na Ị Gaghị Ahapụ Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị

IHE Ọ PỤTARA

Ndị di na nwunye kpebiri na ha agaghị ahapụ ibe ha na-ele alụmdi na nwunye anya ka ihe na-ekwesịghị itisa etisa. Ọ na-emekwa ka obi na-eru ha ala. Obi na-esi ha ike na o nweghị onye ga-ahapụ ibe ya, ọ bụrụgodị na ihe esie ike.

Ihe mere ụfọdụ ndị di na nwunye agbabeghị alụkwaghịm bụ n’ihi otú ndị enyi na ndị ezinụlọ ha ga-esi ele ya anya. Ma, ọ kacha mma ka ihe ga-eme ka ha ghara itisa bụrụ mkpebi ha mere ịnọgide na-ahụ onwe ha n’anya ma na-asọpụrụ ibe ha.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Di ekwesịghịkwa ịhapụ nwunye ya.”—1 Ndị Kọrịnt 7:11.

Otu nwoke aha ya bụ Micah kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị chọghị ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị tisaa, ị gaghị na-ewe iwe ngwa ngwa. Ị ga na-agbaghara mmejọ ngwa ngwa, na-arịọkwa mgbaghara ozugbo i mejọrọ. Ị ga na-elekwa nsogbu ọ bụla bịaara unu anya ka ihe a ga-edozili, ọ bụghị ka ihe ga-etisa unu.”

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Ọ bụrụ na nsogbu abịa, di na nwunye na-ahụghị ibe ha n’anya nwere ike kwuwe na ‘ha abụọ ekwesịdịghị ịlụ,’ ma chọwazie otú ha ga-esi gbaa alụkwaghịm.

Otu nwaanyị aha ya bụ Jean kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị lụwa di ma ọ bụ nwunye, ha na-eburu n’uche na ọ bụrụ na ihe agaghị otú ha tụrụ anya ya, ha agbaa alụkwaghịm. Onye bu ụdị ihe a n’obi lụọ di ma ọ bụ nwunye ejighị alụmdi na nwunye kpọrọ ihe ma otu.”

IHE I NWERE IKE IME

CHEBARA IHE NDỊ A ECHICHE

Ọ bụrụ na unu sewe okwu . . .

  • Ị̀ na-akwawa ụta na ị lụrụ di gị ma ọ bụ nwunye gị?

  • Ọ̀ na-adị gị ka ya bụrụ na ọ bụ onye ọzọ ka ị lụrụ?

  • Ị̀ na-ekwu ihe ndị dị ka: “M ga-ahapụ gị” ma ọ bụ “ka m gaa chọrọ onye ga-ahụ m n’anya”?

Ọ bụrụ na ị zara ee n’otu n’ime ajụjụ ndị a ma ọ bụ karịa, i kwesịrị ibido ugbu a mewe ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị dịkwuo ná mma.

GỊ NA DI GỊ MA Ọ BỤ NWUNYE GỊ ZAA AJỤJỤ NDỊ A

  • Otú anyị si hụ onwe anyị n’anya ò belatala? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị kpatara ya?

  • Olee ihe ndị anyị nwere ike ime iji mee ka ihe dịkwa otú ọ dịbu?

IHE NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA

  • Ị gụrụ gụrụ gị edee ihe nye di gị ma ọ bụ nwunye gị, ma ọ bụkwanụ gị ezigara ya ozi gwa ya na ị hụrụ ya n’anya

  • Dowe foto di gị ma ọ bụ nwunye gị n’ebe ị na-arụ ọrụ iji gosi na ị hụrụ ya n’anya

  • Kpọọ di gị ma ọ bụ nwunye gị n’ekwentị iji mara otú o mere n’oge unu gara ọrụ ma ọ bụ oge unu na-anọghị nso

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—Matiu 19:6.